Native Bible

Revelation 2:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị Pegamọm, sị ya: Ndị a bụ okwu si nʼọnụ onye ahụ ji mma agha ahụ dị nkọ nke nwere ihu abụọ nʼaka ya.

Revelation 2:12 in English

Revelation 2:12 · Berean Standard Bible

To the angel of the church in Pergamum write: These are the words of the One who holds the sharp, double-edged sword.

Context

10Atụkwala egwu nʼihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nʼihi na ekwensu nʼonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nʼime ndị gị nʼụlọ mkpọrọ, ka o jiri ya nwalee gị. A ga-akpagbu unu abalị iri. Ma gosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, ọ bụladị ruo mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, a ga m enye gị okpueze ahụ, bụ ndụ. 11Onye ọbụla nwere ntị ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. Onye ọbụla na-emeri emeri, ọnwụ nke ugboro abụọ agaghị emekpa ya ahụ. 12“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị Pegamọm, sị ya: Ndị a bụ okwu si nʼọnụ onye ahụ ji mma agha ahụ dị nkọ nke nwere ihu abụọ nʼaka ya. 13Amaara m ebe i bi, bụ obodo ebe ekwensu nwere ocheeze ya. Ma ị na-anọgidesi ike nʼaha m. Ị jụrụ ịgọnarị okwukwe gị nʼime m, ọ bụladị nʼoge Antipas onyeama m kwesiri ntụkwasị obi, bụ onye e gburu nʼobodo unu, ebe ekwensu bi. 14Ma enwere m ihe ole ma ole megide gị. I nwere ụfọdụ mmadụ ebe ahụ, ndị jidesiri nkuzi Belam ike, bụ onye kuziiri Balak ka o raa ụmụ Izrel ụra nke mere ka ha mehie, rie ihe a chụrụ nʼaja nye arụsị, kwaakwa iko.*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.