Mkpughe 2:27
Revelation 2:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ahụ, ‘ga-eji mkpara igwe chịa ha, dịka mgbe a kụwachara ite aja na mpekele na mpekele.’* Ọ bụladị ka Nna m si nye m ike,
Revelation 2:27 in English
Revelation 2:27 · Berean Standard Bible
He will rule them with an iron scepter and shatter them like pottery *—just as I have received authority from My Father.
Context
25ma ọ bụghị, unu jidesienụ ihe unu nwere aka ike tutu ruo mgbe m ga-abịa.’ 26Ma onye ọbụla na-emeri emeri, na-anọgidekwa na-eme uche m ruo ọgwụgwụ ihe niile, ka m ga-enye ikike nʼebe mba niile nọ. 27Onye ahụ, ‘ga-eji mkpara igwe chịa ha, dịka mgbe a kụwachara ite aja na mpekele na mpekele.’* Ọ bụladị ka Nna m si nye m ike, 28a ga-enye onye nke meririnụ kpakpando ụtụtụ. 29Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile.
2:14 Ọ bụ Belam kuziri Balak ụzọ ọ ga-esi rara ndị Izrel nye na nnupu isi megide iwu Chineke nyere ha banyere ife arụsị, nʼakwụkwọ Ọnụ 31:15-16, ịkwa iko na ịlụ di maọbụ nwunye site na mba ọzọ. Iwu ndị a dị nʼakwụkwọ Dit 7:3-11.
2:20 Onye amụma nwanyị Ọ bụ onye amụma ụgha nʼihi na ihe ọ na-akụzi megidere iwu Chineke.
2:24 Ihe nzuzo dị omimi E nwere ọdị iche nʼetiti ihe omimi Mmụọ Nsọ na-ekpughe dị ka e dere nʼakwụkwọ 1Kọ 2:10, site nʼihe omimi ndị ọzọ. Ya mere, o ji dị mkpa na mmadụ ga-akpachapụ anya mgbe ọbụla onye dị otu na-achọ ịmata ụfọdụ ihe omimi, ka ọ rịọ inyeaka mmụọ nsọ.
2:27 Abụ 2:9
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.