Native Bible

Revelation 2:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma onye ọbụla na-emeri emeri, na-anọgidekwa na-eme uche m ruo ọgwụgwụ ihe niile, ka m ga-enye ikike nʼebe mba niile nọ.

Revelation 2:26 in English

Revelation 2:26 · Berean Standard Bible

And to the one who overcomes and continues in My work until the end, I will give authority over the nations.

Context

24Ugbu a, ana m agwa unu ndị fọdụrụ na Tiatira, unu ndị na-agbasoghị ozizi ya, ndị na-amụtabekwaghị ihe ndị ahụ ekwensu kpọrọ ihe nzuzo dị omimi,* ‘O nweghị ibu arọ ọzọ m ga-ebokwasị unu, 25ma ọ bụghị, unu jidesienụ ihe unu nwere aka ike tutu ruo mgbe m ga-abịa.’ 26Ma onye ọbụla na-emeri emeri, na-anọgidekwa na-eme uche m ruo ọgwụgwụ ihe niile, ka m ga-enye ikike nʼebe mba niile nọ. 27Onye ahụ, ‘ga-eji mkpara igwe chịa ha, dịka mgbe a kụwachara ite aja na mpekele na mpekele.’* Ọ bụladị ka Nna m si nye m ike, 28a ga-enye onye nke meririnụ kpakpando ụtụtụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.