Mkpughe 19:9
Revelation 19:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mmụọ ozi ahụ gwara m sị, “Dee nke a: Ngọzị dịrị ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa soro nʼoriri ọlụlụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.” Ọ gwakwara m sị, “Nʼeziokwu, ndị a bụ okwu nke Chineke.”
Revelation 19:9 in English
Revelation 19:9 · Berean Standard Bible
Then the angel told me to write, “Blessed are those who are invited to the marriage supper of the Lamb.” And he said to me, “These are the true words of God.”
Context
7Ka anyị ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi tọkwaa anyị ụtọ.
Ka anyị nye ya otuto.
Nʼihi na ọlụlụ di na nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ eruola,
nwunye ya edoziekwala onwe ya. 8E nyela ya ezi akwa ọcha nke na-enweghị ntụpọ ọbụla,
na nke dị nnọọ ezi ọcha ka o yikwasị onwe ya.”
(Ezi akwa ọcha ahụ nọchiri anya ọrụ ezi omume nke ndị nsọ rụrụ.) 9Mmụọ ozi ahụ gwara m sị, “Dee nke a: Ngọzị dịrị ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa soro nʼoriri ọlụlụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.” Ọ gwakwara m sị, “Nʼeziokwu, ndị a bụ okwu nke Chineke.” 10Adara m nʼala nʼụkwụ ya ịkpọ isiala nye ya, ma ọ gwara m sị, “O kwesighị ka ị kpọọ isiala nye m nʼihi na abụ m naanị onyeozi ibe gị, na dịka ọtụtụ ụmụnna gị ndị na-agba ama banyere Jisọs. Ọ bụ naanị Chineke ka i kwesiri ịkpọ isiala nye. Nʼihi na ọ bụ Mmụọ nke amụma na-agba ama ihe banyere Jisọs.” 11Mgbe ahụ kwa, elere m anya hụ ka eluigwe meghere. Ahụkwara m otu ịnyịnya dị ọcha. Onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ onye a na-akpọ Onye kwesiri ntụkwasị obi na Onye eziokwu. Ọ bụ onye na-ekpe ikpe nʼụzọ ziri ezi na-ebukwa agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.