Native Bible

Revelation 19:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

E nyela ya ezi akwa ọcha nke na-enweghị ntụpọ ọbụla, na nke dị nnọọ ezi ọcha ka o yikwasị onwe ya.” (Ezi akwa ọcha ahụ nọchiri anya ọrụ ezi omume nke ndị nsọ rụrụ.)

Revelation 19:8 in English

Revelation 19:8 · Berean Standard Bible

She was given clothing of fine linen, bright and pure.” For the fine linen she wears is the righteous acts of the saints.

Context

6Mgbe ahụ, anụkwara m olu dara ka olu igwe mmadụ dịkwa ka ụzụ mmiri na-ekwo ekwo, dịkwa ka ụda egbe eluigwe dasiri ike na-asị, “Haleluya! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na-achị. 7Ka anyị ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi tọkwaa anyị ụtọ. Ka anyị nye ya otuto. Nʼihi na ọlụlụ di na nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ eruola, nwunye ya edoziekwala onwe ya. 8E nyela ya ezi akwa ọcha nke na-enweghị ntụpọ ọbụla, na nke dị nnọọ ezi ọcha ka o yikwasị onwe ya.” (Ezi akwa ọcha ahụ nọchiri anya ọrụ ezi omume nke ndị nsọ rụrụ.) 9Mmụọ ozi ahụ gwara m sị, “Dee nke a: Ngọzị dịrị ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa soro nʼoriri ọlụlụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.” Ọ gwakwara m sị, “Nʼeziokwu, ndị a bụ okwu nke Chineke.” 10Adara m nʼala nʼụkwụ ya ịkpọ isiala nye ya, ma ọ gwara m sị, “O kwesighị ka ị kpọọ isiala nye m nʼihi na abụ m naanị onyeozi ibe gị, na dịka ọtụtụ ụmụnna gị ndị na-agba ama banyere Jisọs. Ọ bụ naanị Chineke ka i kwesiri ịkpọ isiala nye. Nʼihi na ọ bụ Mmụọ nke amụma na-agba ama ihe banyere Jisọs.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.