Mkpughe 19:11
Revelation 19:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ kwa, elere m anya hụ ka eluigwe meghere. Ahụkwara m otu ịnyịnya dị ọcha. Onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ onye a na-akpọ Onye kwesiri ntụkwasị obi na Onye eziokwu. Ọ bụ onye na-ekpe ikpe nʼụzọ ziri ezi na-ebukwa agha.
Revelation 19:11 in English
Revelation 19:11 · Berean Standard Bible
Then I saw heaven standing open, and there before me was a white horse. And its rider is called Faithful and True. With righteousness He judges and wages war.
Context
9Mmụọ ozi ahụ gwara m sị, “Dee nke a: Ngọzị dịrị ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa soro nʼoriri ọlụlụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.” Ọ gwakwara m sị, “Nʼeziokwu, ndị a bụ okwu nke Chineke.” 10Adara m nʼala nʼụkwụ ya ịkpọ isiala nye ya, ma ọ gwara m sị, “O kwesighị ka ị kpọọ isiala nye m nʼihi na abụ m naanị onyeozi ibe gị, na dịka ọtụtụ ụmụnna gị ndị na-agba ama banyere Jisọs. Ọ bụ naanị Chineke ka i kwesiri ịkpọ isiala nye. Nʼihi na ọ bụ Mmụọ nke amụma na-agba ama ihe banyere Jisọs.” 11Mgbe ahụ kwa, elere m anya hụ ka eluigwe meghere. Ahụkwara m otu ịnyịnya dị ọcha. Onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ onye a na-akpọ Onye kwesiri ntụkwasị obi na Onye eziokwu. Ọ bụ onye na-ekpe ikpe nʼụzọ ziri ezi na-ebukwa agha. 12Anya ya na-acha dịka ire ọkụ. Ọtụtụ okpueze dịkwa ya nʼisi. Otu aha nke naanị ya maara omimi ya ka e dekwasịrị ya nʼegedege ihu. 13E gbokwasịrị ya uwe mwụda e denyere nʼọbara. Aha a na-akpọ ya bụ Okwu Chineke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.