Mkpughe 18:17
Revelation 18:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼotu awa a ka a lara oke akụ niile ndị a nʼiyi.’ “Ndị niile nwee ụgbọ na-aga nʼoke osimiri, na ndị na-akwọ ụgbọ ndị ahịa nʼoke osimiri, na ndị niile na-eso ụgbọ mmiri ga-anọ nʼebe tere anya,
Revelation 18:17 in English
Revelation 18:17 · Berean Standard Bible
For in a single hour such fabulous wealth has been destroyed!” Every shipmaster, passenger, and sailor, and all who make their living from the sea, will stand at a distance
Context
15Ndị ahịa ahụ bara ọgaranya site nʼaka ya, ga-anọ nʼebe dị anya, nʼihi oke egwu nke ntaramahụhụ ya, na-eru ụjụ, na-ebesikwa akwa ike. 16“ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu ahụ,
nke e yikwasịrị ezi akwa ọcha, nke na-acha odo odo na ọbara ọbara
nke nya ihe ịchọ mma nke ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche na nkume pieal dị iche iche. 17Nʼotu awa a ka a lara oke akụ niile ndị a nʼiyi.’
“Ndị niile nwee ụgbọ na-aga nʼoke osimiri, na ndị na-akwọ ụgbọ ndị ahịa nʼoke osimiri, na ndị niile na-eso ụgbọ mmiri ga-anọ nʼebe tere anya, 18na-eti mkpu mgbe ha ga na-ele anya na-ahụ anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼire ọkụ ya na-asị, ‘Olee obodo ọzọ dịka obodo ukwuu a?’ 19Ha ga-ekpokwasị aja nʼisi igosi obi ọjọọ ha na-eti mkpu akwa na-asị,
“ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu a maara aha ya
ebe ndị niile nwere ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri
ghọrọ ndị ọgaranya site nʼakụ dị nʼime ya.
Ma ugbu a, nʼotu ntabi anya, ihe niile dị nʼime ya bụ ihe a laara nʼiyi.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.