Mkpughe 16:7
Revelation 16:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ kwa, anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ na-anọ nʼebe ịchụ aja sịrị, “E, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, ikpe gị niile bụ nke ziri ezi, bụrụkwa eziokwu.”
Revelation 16:7 in English
Revelation 16:7 · Berean Standard Bible
And I heard the altar reply: “Yes, Lord God Almighty, true and just are Your judgments.”
Context
5Anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ mmiri niile dị nʼaka ya kwuru okwu sị,
“I kpere ikpe ziri ezi, Gị, Onye dị Nsọ,
na onye na-adị site na mmalite, na onye na-adịkwa ugbu a. 6Nʼihi na ha wụsara ọbara ndị nsọ gị na ndị amụma gị.
Ma ugbu a, i nyela ha ọbara ka ha ṅụọ. Nke a bụkwa ezi ụgwọ ọrụ ha kwesiri ịnata.” 7Mgbe ahụ kwa, anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ na-anọ nʼebe ịchụ aja sịrị,
“E, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile,
ikpe gị niile bụ nke ziri ezi, bụrụkwa eziokwu.” 8Mmụọ ozi nke anọ pụrụ wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu anyanwụ si otu a mee ka anwụ were okpomọkụ ya chagbuo ndị mmadụ. 9Okpomọkụ ahụ si nʼanyanwụ bịa rere onye ọbụla ọkụ nʼahụ. Nke a mere ka ndị mmadụ bido ịkọcha aha Chineke, onye nwere ike ịchị ihe otiti ndị a, ma ha jụrụ ichegharị nye ya otuto.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.