Mkpughe 16:6
Revelation 16:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ha wụsara ọbara ndị nsọ gị na ndị amụma gị. Ma ugbu a, i nyela ha ọbara ka ha ṅụọ. Nke a bụkwa ezi ụgwọ ọrụ ha kwesiri ịnata.”
Revelation 16:6 in English
Revelation 16:6 · Berean Standard Bible
For they have spilled the blood of saints and prophets, and You have given them blood to drink, as they deserve.”
Context
4Mmụọ ozi nke atọ pụrụ gaa wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu iyi na nʼelu isi iyi niile. Nke a mere ka ha niile ghọọ ọbara. 5Anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ mmiri niile dị nʼaka ya kwuru okwu sị,
“I kpere ikpe ziri ezi, Gị, Onye dị Nsọ,
na onye na-adị site na mmalite, na onye na-adịkwa ugbu a. 6Nʼihi na ha wụsara ọbara ndị nsọ gị na ndị amụma gị.
Ma ugbu a, i nyela ha ọbara ka ha ṅụọ. Nke a bụkwa ezi ụgwọ ọrụ ha kwesiri ịnata.” 7Mgbe ahụ kwa, anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ na-anọ nʼebe ịchụ aja sịrị,
“E, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile,
ikpe gị niile bụ nke ziri ezi, bụrụkwa eziokwu.” 8Mmụọ ozi nke anọ pụrụ wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu anyanwụ si otu a mee ka anwụ were okpomọkụ ya chagbuo ndị mmadụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.