Mkpughe 15:5
Revelation 15:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe nke a gasịrị, elere m anya hụ, na e meghere, ụlọnsọ ukwu dị nʼeluigwe, ya bụ, ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ.
Revelation 15:5 in English
Revelation 15:5 · Berean Standard Bible
After this I looked, and the temple—the tabernacle of the Testimony—was opened in heaven.
Context
3Ha na-abụ abụ Mosis ohu Chineke, na abụ Nwa atụrụ ahụ.
“Ọrụ gị niile dị ukwuu dịkwa ebube,
Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile.
Ụzọ gị niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu,
Gị, Eze nke mba niile. 4Onye ga-aghara ịtụ gị egwu, Onyenwe anyị,
onye ga-agharakwa ito aha gị?
Nʼihi na ọ bụ naanị gị dị nsọ.
Mba niile ga-abịakwa
ịkpọ isiala nʼihu gị,
nʼihi na emeela ka ọrụ ezi omume gị pụta ìhè.” 5Mgbe nke a gasịrị, elere m anya hụ, na e meghere, ụlọnsọ ukwu dị nʼeluigwe, ya bụ, ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ. 6Mmụọ ozi asaa ndị ahụ ji ihe ntaramahụhụ asaa sị nʼụlọnsọ ahụ pụta. Ha yi uwe ogho ọcha, akwa ọcha na-enwu ezigbo ọcha. E kekwasịrị ihe okike ọlaedo gburugburu obi ha. 7Otu nʼime anụ anọ ndị ahụ dị ndụ bunyere mmụọ ozi asaa ndị ahụ efere ọlaedo asaa a gbajuru ọnụma Chineke, bụ onye ahụ na-adị ndụ mgbe niile ebighị ebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.