Mkpughe 15:4
Revelation 15:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ga-aghara ịtụ gị egwu, Onyenwe anyị, onye ga-agharakwa ito aha gị? Nʼihi na ọ bụ naanị gị dị nsọ. Mba niile ga-abịakwa ịkpọ isiala nʼihu gị, nʼihi na emeela ka ọrụ ezi omume gị pụta ìhè.”
Revelation 15:4 in English
Revelation 15:4 · Berean Standard Bible
Who will not fear You, O Lord, and glorify Your name? For You alone are holy. All nations will come and worship before You, for Your righteous acts have been revealed.”
Context
2Ahụrụ m ihe dịka oke osimiri enyo a gwakọtara ya na ọkụ, na ndị ahụ nweterala mmeri nʼebe anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya, na ọnụọgụgụ aha ya. Ha guzo nʼakụkụ oke osimiri enyo ahụ, jidekwa ụbọ akwara nke Chineke nʼaka ha. 3Ha na-abụ abụ Mosis ohu Chineke, na abụ Nwa atụrụ ahụ.
“Ọrụ gị niile dị ukwuu dịkwa ebube,
Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile.
Ụzọ gị niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu,
Gị, Eze nke mba niile. 4Onye ga-aghara ịtụ gị egwu, Onyenwe anyị,
onye ga-agharakwa ito aha gị?
Nʼihi na ọ bụ naanị gị dị nsọ.
Mba niile ga-abịakwa
ịkpọ isiala nʼihu gị,
nʼihi na emeela ka ọrụ ezi omume gị pụta ìhè.” 5Mgbe nke a gasịrị, elere m anya hụ, na e meghere, ụlọnsọ ukwu dị nʼeluigwe, ya bụ, ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ. 6Mmụọ ozi asaa ndị ahụ ji ihe ntaramahụhụ asaa sị nʼụlọnsọ ahụ pụta. Ha yi uwe ogho ọcha, akwa ọcha na-enwu ezigbo ọcha. E kekwasịrị ihe okike ọlaedo gburugburu obi ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.