Native Bible

Revelation 13:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye nwere ntị ya nụrụ.

Revelation 13:9 in English

Revelation 13:9 · Berean Standard Bible

He who has an ear, let him hear:

Context

7E nyere ya ike ibuso ndị nsọ agha na imeri ha. E nyekwara ya ikike ịchị agbụrụ niile, na ebo niile, na ndị niile, na mba niile na asụsụ niile. 8Ndị niile bi nʼelu ụwa ga-akpọkwa isiala nye ya, bụ onye ọbụla a na-edeghị aha ya nʼime akwụkwọ nke ndụ nke Nwa atụrụ ahụ e gbururị, site nʼoge e kere ụwa. 9Onye nwere ntị ya nụrụ. 10“Ọ bụrụ na ọ dị onye ọbụla a ga-adọta nʼagha, ọ bụ ha ka a ga-adọtakwa nʼagha. Ọ bụrụ na ọ dị onye ọbụla ga-anwụ site na mma agha, aghaghị iji mma agha gbuo ha.”* Ka nke a bụrụ ihe ịgbaume na iguzosikwa ike nʼokwukwe nke ndị Chineke. 11Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m anụ ọhịa ọzọ dị iche ka o si nʼala na-arịpụta. O nwere mpi nta abụọ dịka mpi Nwa atụrụ, kama ọ na-ekwu okwu dịka agwọ ochie ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.