Mkpughe 13:9
Revelation 13:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye nwere ntị ya nụrụ.
Revelation 13:9 in English
Revelation 13:9 · Berean Standard Bible
He who has an ear, let him hear:
Context
7E nyere ya ike ibuso ndị nsọ agha na imeri ha. E nyekwara ya ikike ịchị agbụrụ niile, na ebo niile, na ndị niile, na mba niile na asụsụ niile. 8Ndị niile bi nʼelu ụwa ga-akpọkwa isiala nye ya, bụ onye ọbụla a na-edeghị aha ya nʼime akwụkwọ nke ndụ nke Nwa atụrụ ahụ e gbururị, site nʼoge e kere ụwa. 9Onye nwere ntị ya nụrụ. 10“Ọ bụrụ na ọ dị onye ọbụla a ga-adọta nʼagha,
ọ bụ ha ka a ga-adọtakwa nʼagha.
Ọ bụrụ na ọ dị onye ọbụla ga-anwụ site na mma agha,
aghaghị iji mma agha gbuo ha.”*
Ka nke a bụrụ ihe ịgbaume na iguzosikwa ike nʼokwukwe nke ndị Chineke. 11Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m anụ ọhịa ọzọ dị iche ka o si nʼala na-arịpụta. O nwere mpi nta abụọ dịka mpi Nwa atụrụ, kama ọ na-ekwu okwu dịka agwọ ochie ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.