Mkpughe 13:8
Revelation 13:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị niile bi nʼelu ụwa ga-akpọkwa isiala nye ya, bụ onye ọbụla a na-edeghị aha ya nʼime akwụkwọ nke ndụ nke Nwa atụrụ ahụ e gbururị, site nʼoge e kere ụwa.
Revelation 13:8 in English
Revelation 13:8 · Berean Standard Bible
And all who dwell on the earth will worship the beast—all whose names have not been written from the foundation of the world in the Book of Life belonging to the Lamb who was slain.*
Context
6O meghere ọnụ ya malite ikwulu Chineke, na aha ya na ebe obibi ya, na ndụ ahụ bụ ndị bi nʼeluigwe. 7E nyere ya ike ibuso ndị nsọ agha na imeri ha. E nyekwara ya ikike ịchị agbụrụ niile, na ebo niile, na ndị niile, na mba niile na asụsụ niile. 8Ndị niile bi nʼelu ụwa ga-akpọkwa isiala nye ya, bụ onye ọbụla a na-edeghị aha ya nʼime akwụkwọ nke ndụ nke Nwa atụrụ ahụ e gbururị, site nʼoge e kere ụwa. 9Onye nwere ntị ya nụrụ. 10“Ọ bụrụ na ọ dị onye ọbụla a ga-adọta nʼagha,
ọ bụ ha ka a ga-adọtakwa nʼagha.
Ọ bụrụ na ọ dị onye ọbụla ga-anwụ site na mma agha,
aghaghị iji mma agha gbuo ha.”*
Ka nke a bụrụ ihe ịgbaume na iguzosikwa ike nʼokwukwe nke ndị Chineke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.