Mkpughe 10:8
Revelation 10:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Olu nke ahụ m nụrụ mbụ sitere nʼeluigwe gwa m okwu ọzọ, na-asị, “Gaa nara mmụọ ozi ahụ guzo nʼelu oke osimiri na ala akọrọ, akwụkwọ ahụ aseghere aseghe nke o ji nʼaka ya.”
Revelation 10:8 in English
Revelation 10:8 · Berean Standard Bible
Then the voice that I had heard from heaven spoke to me again, saying, “Go, take the small scroll that lies open in the hand of the angel standing on the sea and on the land.”
Context
6were onye ahụ na-adị ndụ mgbe niile ebighị ebi ṅụọ iyi. Ya bụ onye ahụ kere eluigwe na ụwa, na ihe niile dị nʼime ha, na oke osimiri, na ndị niile bi nʼime ha, sị na oge ezuola. Na o kwesikwaghị ka a tufuo oge ọbụla. 7Nʼụbọchị ahụ, mgbe ndị mmụọ ozi asaa ahụ ga-afụ opi ike ha, ihe omimi niile nke Chineke ga-emezu, dịka ọ gwara ndị ohu ya bụ ndị amụma. 8Olu nke ahụ m nụrụ mbụ sitere nʼeluigwe gwa m okwu ọzọ, na-asị, “Gaa nara mmụọ ozi ahụ guzo nʼelu oke osimiri na ala akọrọ, akwụkwọ ahụ aseghere aseghe nke o ji nʼaka ya.” 9Ejekwuru m mmụọ ozi ahụ gwa ya ka o nye m akwụkwọ nta ahụ. Ọ sịrị m, “Nara ya, taa ya. Ọ ga-eme ka afọ gị luo ilu, ma ‘nʼọnụ gị, ọ ga-atọ gị ụtọ dịka mmanụ aṅụ.’*” 10Ya mere, anaara m ya akwụkwọ nta ahụ site nʼaka mmụọ ozi ahụ taa ya. Ọ tọrọ ụtọ dịka mmanụ aṅụ nʼọnụ m, ma mgbe m lodara ya, afọ m bidoro ilu ilu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.