Native Bible

Revelation 10:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ejekwuru m mmụọ ozi ahụ gwa ya ka o nye m akwụkwọ nta ahụ. Ọ sịrị m, “Nara ya, taa ya. Ọ ga-eme ka afọ gị luo ilu, ma ‘nʼọnụ gị, ọ ga-atọ gị ụtọ dịka mmanụ aṅụ.’*”

Revelation 10:9 in English

Revelation 10:9 · Berean Standard Bible

And I went to the angel and said, “Give me the small scroll.” “Take it and eat it,” he said. “It will make your stomach bitter, but in your mouth it will be as sweet as honey.”*

Context

7Nʼụbọchị ahụ, mgbe ndị mmụọ ozi asaa ahụ ga-afụ opi ike ha, ihe omimi niile nke Chineke ga-emezu, dịka ọ gwara ndị ohu ya bụ ndị amụma. 8Olu nke ahụ m nụrụ mbụ sitere nʼeluigwe gwa m okwu ọzọ, na-asị, “Gaa nara mmụọ ozi ahụ guzo nʼelu oke osimiri na ala akọrọ, akwụkwọ ahụ aseghere aseghe nke o ji nʼaka ya.” 9Ejekwuru m mmụọ ozi ahụ gwa ya ka o nye m akwụkwọ nta ahụ. Ọ sịrị m, “Nara ya, taa ya. Ọ ga-eme ka afọ gị luo ilu, ma ‘nʼọnụ gị, ọ ga-atọ gị ụtọ dịka mmanụ aṅụ.’*” 10Ya mere, anaara m ya akwụkwọ nta ahụ site nʼaka mmụọ ozi ahụ taa ya. Ọ tọrọ ụtọ dịka mmanụ aṅụ nʼọnụ m, ma mgbe m lodara ya, afọ m bidoro ilu ilu. 11Mgbe ahụ ha sịrị m, “Ị ghaghị ibu amụma ọzọ banyere ọtụtụ mmadụ, na ọtụtụ mba, na ọtụtụ asụsụ na ọtụtụ ndị eze.” 10:9 Izk 3:3

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.