Native Bible

Revelation 10:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

were onye ahụ na-adị ndụ mgbe niile ebighị ebi ṅụọ iyi. Ya bụ onye ahụ kere eluigwe na ụwa, na ihe niile dị nʼime ha, na oke osimiri, na ndị niile bi nʼime ha, sị na oge ezuola. Na o kwesikwaghị ka a tufuo oge ọbụla.

Revelation 10:6 in English

Revelation 10:6 · Berean Standard Bible

And he swore by Him who lives forever and ever, who created heaven and everything in it, the earth and everything in it, and the sea and everything in it: “There will be no more delay!

Context

4Mgbe m chọrọ idetu ihe egbe eluigwe ndị a kwuru, anụrụ m otu olu si nʼeluigwe na-ekwu, “Edela ihe ahụ nʼakwụkwọ, nʼihi na-achọghị ka ndị ọzọ mata okwu ahụ egbe eluigwe ndị ahụ kwuru.” 5Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nke m hụrụ zọkwasịrị ụkwụ ya nʼelu osimiri, na nʼala akọrọ ahụ, chịlịri aka ya abụọ elu, 6were onye ahụ na-adị ndụ mgbe niile ebighị ebi ṅụọ iyi. Ya bụ onye ahụ kere eluigwe na ụwa, na ihe niile dị nʼime ha, na oke osimiri, na ndị niile bi nʼime ha, sị na oge ezuola. Na o kwesikwaghị ka a tufuo oge ọbụla. 7Nʼụbọchị ahụ, mgbe ndị mmụọ ozi asaa ahụ ga-afụ opi ike ha, ihe omimi niile nke Chineke ga-emezu, dịka ọ gwara ndị ohu ya bụ ndị amụma. 8Olu nke ahụ m nụrụ mbụ sitere nʼeluigwe gwa m okwu ọzọ, na-asị, “Gaa nara mmụọ ozi ahụ guzo nʼelu oke osimiri na ala akọrọ, akwụkwọ ahụ aseghere aseghe nke o ji nʼaka ya.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.