Mkpughe 10:5
Revelation 10:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nke m hụrụ zọkwasịrị ụkwụ ya nʼelu osimiri, na nʼala akọrọ ahụ, chịlịri aka ya abụọ elu,
Revelation 10:5 in English
Revelation 10:5 · Berean Standard Bible
Then the angel I had seen standing on the sea and on the land lifted up his right hand to heaven.
Context
3O ji oke olu, nke dara ụda dịka ịgbọ ụja ọdụm, tie mkpu, egbe eluigwe asaa gbara otu mgbe ahụ. 4Mgbe m chọrọ idetu ihe egbe eluigwe ndị a kwuru, anụrụ m otu olu si nʼeluigwe na-ekwu, “Edela ihe ahụ nʼakwụkwọ, nʼihi na-achọghị ka ndị ọzọ mata okwu ahụ egbe eluigwe ndị ahụ kwuru.” 5Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nke m hụrụ zọkwasịrị ụkwụ ya nʼelu osimiri, na nʼala akọrọ ahụ, chịlịri aka ya abụọ elu, 6were onye ahụ na-adị ndụ mgbe niile ebighị ebi ṅụọ iyi. Ya bụ onye ahụ kere eluigwe na ụwa, na ihe niile dị nʼime ha, na oke osimiri, na ndị niile bi nʼime ha, sị na oge ezuola. Na o kwesikwaghị ka a tufuo oge ọbụla. 7Nʼụbọchị ahụ, mgbe ndị mmụọ ozi asaa ahụ ga-afụ opi ike ha, ihe omimi niile nke Chineke ga-emezu, dịka ọ gwara ndị ohu ya bụ ndị amụma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.