Abụ Ọma 99:3
Psalms 99:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka ha too aha gị nke dị ukwuu, dịkwa oke egwu, ọ dị nsọ.
Psalms 99:3 in English
Psalms 99:3 · Berean Standard Bible
Let them praise Your great and awesome name— He is holy!*
Context
1Onyenwe anyị bụ eze,
ka mba niile maa jijiji!
O wuru ocheeze ya nʼetiti cherubim,
ka elu ụwa maa jijiji. 2Onyenwe anyị dị ukwuu nʼime Zayọn;
ọ bụ onye e buliri elu karịa mba niile dị iche iche. 3Ka ha too aha gị nke dị ukwuu, dịkwa oke egwu,
ọ dị nsọ. 4Eze bụ onye dị ike, ọ hụrụ ikpe ziri ezi nʼanya,
i meela ka ihe ziri ezi guzosie ike;
nʼime Jekọb ka i mere
ihe ziri ezi na ihe dị mma. 5Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu,
feenụ ofufe nʼihu ebe ihe ịtụkwasị ụkwụ ya;
ọ dị nsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.