Abụ Ọma 98:4
Psalms 98:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ;
Psalms 98:4 in English
Psalms 98:4 · Berean Standard Bible
Make a joyful noise to the LORD, all the earth; break forth—let your cry ring out, and sing praises!
Context
2Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya
o kpugheela ezi omume ya nye mba niile. 3O chetala ịhụnanya ya
na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị;
nsọtụ nke ụwa niile ahụla
nzọpụta Chineke anyị. 4Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile
jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ; 5werenụ ụbọ akwara bụkuo Onyenwe anyị abụ,
e, were ụbọ akwara na olu abụ ọma, 6jirinụ opi na opi ike,
tisie mkpu ọṅụ ike nʼihu Onyenwe anyị, Onye bụ Eze.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.