Native Bible

Psalms 9:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ọ kwadoola ocheeze ya maka ikpe ikpe ziri ezi.

Psalms 9:7 in English

Psalms 9:7 · Berean Standard Bible

But the LORD abides forever; He has established His throne for judgment.

Context

5I baarala mba niile mba ma laa ndị ajọ omume nʼiyi, hichapụkwa aha ha ruo mgbe ebighị ebi. 6Mbibi nke na-enweghị ọgwụgwụ adakwasịla ndị iro m, I hopukwala obodo ha niile. Ọ dịghị onye na-echetakwa ha ọzọ. 7Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ọ kwadoola ocheeze ya maka ikpe ikpe ziri ezi. 8Ọ ga-eji ezi omume kpee mba niile ikpe; jirikwa ikpe ziri ezi chịa mba niile. 9Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu. Ọ bụụrụ ha ebe mgbaba e wusiri ike nʼoge nsogbu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.