Abụ Ọma 9:6
Psalms 9:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mbibi nke na-enweghị ọgwụgwụ adakwasịla ndị iro m, I hopukwala obodo ha niile. Ọ dịghị onye na-echetakwa ha ọzọ.
Psalms 9:6 in English
Psalms 9:6 · Berean Standard Bible
The enemy has come to eternal ruin, and You have uprooted their cities; the very memory of them has vanished.
Context
4I kpeela ikpe m nʼụzọ ziri ezi,
nʼocheeze gị ka ị nọdụrụ na-ekpe ikpe ziri ezi. 5I baarala mba niile mba ma laa ndị ajọ omume nʼiyi,
hichapụkwa aha ha ruo mgbe ebighị ebi. 6Mbibi nke na-enweghị ọgwụgwụ adakwasịla ndị iro m,
I hopukwala obodo ha niile.
Ọ dịghị onye na-echetakwa ha ọzọ. 7Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi.
Ọ kwadoola ocheeze ya maka ikpe ikpe ziri ezi. 8Ọ ga-eji ezi omume kpee mba niile ikpe;
jirikwa ikpe ziri ezi chịa mba niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.