Native Bible

Psalms 9:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị iro m na-alaghachi azụ, ha na-asọ ngọngọ na-alakwa nʼiyi nʼihu gị.

Psalms 9:3 in English

Psalms 9:3 · Berean Standard Bible

When my enemies retreat, they stumble and perish before You.

Context

1O Onyenwe anyị, aga m esite nʼala ala obi m too gị, aga m agwakwa onye ọbụla ihe ọma niile ị na-eme. 2Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị, aga m abụrụ gị abụ otuto, gị Onye kachasị ihe niile elu. 3Ndị iro m na-alaghachi azụ, ha na-asọ ngọngọ na-alakwa nʼiyi nʼihu gị. 4I kpeela ikpe m nʼụzọ ziri ezi, nʼocheeze gị ka ị nọdụrụ na-ekpe ikpe ziri ezi. 5I baarala mba niile mba ma laa ndị ajọ omume nʼiyi, hichapụkwa aha ha ruo mgbe ebighị ebi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.