Abụ Ọma 9:3
Psalms 9:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị iro m na-alaghachi azụ, ha na-asọ ngọngọ na-alakwa nʼiyi nʼihu gị.
Psalms 9:3 in English
Psalms 9:3 · Berean Standard Bible
When my enemies retreat, they stumble and perish before You.
Context
1O Onyenwe anyị, aga m esite nʼala ala obi m too gị,
aga m agwakwa onye ọbụla ihe ọma niile ị na-eme. 2Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị,
aga m abụrụ gị abụ otuto, gị Onye kachasị ihe niile elu. 3Ndị iro m na-alaghachi azụ,
ha na-asọ ngọngọ na-alakwa nʼiyi nʼihu gị. 4I kpeela ikpe m nʼụzọ ziri ezi,
nʼocheeze gị ka ị nọdụrụ na-ekpe ikpe ziri ezi. 5I baarala mba niile mba ma laa ndị ajọ omume nʼiyi,
hichapụkwa aha ha ruo mgbe ebighị ebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.