Abụ Ọma 79:4
Psalms 79:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyị aghọọla ihe ịta ụta nʼebe ndị agbataobi anyị nọ, ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ịchị ọchị, na ihe ịkwa emo.
Psalms 79:4 in English
Psalms 79:4 · Berean Standard Bible
We have become a reproach to our neighbors, a scorn and derision to those around us.
Context
2Ha ewerela ozu ndị ohu gị nye anụ ufe niile nke eluigwe
ka ọ bụrụ ihe oriri nye ha,
werekwa ozu nke ndị nsọ gị nye anụ ọhịa niile nke ụwa. 3Ha awụpụla ọbara dịka mmiri
nʼakụkụ niile nke Jerusalem,
ọ dịghị otu onye fọdụrụ nke ga-eli ndị nwụrụ anwụ. 4Anyị aghọọla ihe ịta ụta nʼebe ndị agbataobi anyị nọ,
ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ịchị ọchị, na ihe ịkwa emo. 5O Onyenwe anyị, ruo olee mgbe? Ị ga-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi?
Ruo olee mgbe ka ekworo gị ga na-ere dịka ọkụ? 6Wụkwasị mba niile ndị na-amaghị gị
dịka Chineke oke iwe gị,
bụ alaeze niile ndị ahụ
na-adịghị akpọku aha gị;
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.