Abụ Ọma 79:2
Psalms 79:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ewerela ozu ndị ohu gị nye anụ ufe niile nke eluigwe ka ọ bụrụ ihe oriri nye ha, werekwa ozu nke ndị nsọ gị nye anụ ọhịa niile nke ụwa.
Psalms 79:2 in English
Psalms 79:2 · Berean Standard Bible
They have given the corpses of Your servants as food to the birds of the air, the flesh of Your saints to the beasts of the earth.
Context
1O Chineke, mba dị iche iche abatala nʼihe nketa gị;
ha emerụọla ụlọnsọ ukwuu gị,
ha etikpọọla Jerusalem, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu. 2Ha ewerela ozu ndị ohu gị nye anụ ufe niile nke eluigwe
ka ọ bụrụ ihe oriri nye ha,
werekwa ozu nke ndị nsọ gị nye anụ ọhịa niile nke ụwa. 3Ha awụpụla ọbara dịka mmiri
nʼakụkụ niile nke Jerusalem,
ọ dịghị otu onye fọdụrụ nke ga-eli ndị nwụrụ anwụ. 4Anyị aghọọla ihe ịta ụta nʼebe ndị agbataobi anyị nọ,
ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ịchị ọchị, na ihe ịkwa emo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.