Abụ Ọma 75:8
Psalms 75:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu iko dị nʼaka Onyenwe anyị nke jupụtara na mmanya na-agba ụfụfụ nke a gwanyekọtara ụda dị iche iche. Ọ na-awụpụ ya, ndị ajọ omume niile nke ụwa na-aṅụ ya ruo mgbe ọ gwụsịrị.
Psalms 75:8 in English
Psalms 75:8 · Berean Standard Bible
For a cup is in the hand of the LORD, full of foaming wine mixed with spices. He pours from His cup, and all the wicked of the earth drink it down to the dregs.
Context
6Ọ dịghị onye ọbụla sitere nʼọwụwa anyanwụ, maọbụ nʼọdịda anyanwụ,
maọbụ nʼọzara nke pụrụ ibuli mmadụ elu. 7Kama ọ bụ Chineke, onye na-ekpe ikpe;
ọ na-eweli otu onye elu, wedakwa onye ọzọ ala. 8Otu iko dị nʼaka Onyenwe anyị
nke jupụtara na mmanya na-agba ụfụfụ nke a gwanyekọtara ụda dị iche iche.
Ọ na-awụpụ ya, ndị ajọ omume niile nke ụwa
na-aṅụ ya ruo mgbe ọ gwụsịrị. 9Ma mụ onwe m, aga m ekwupụta nke a ruo mgbe ebighị ebi.
Aga m abụku Chineke nke Jekọb abụ otuto, 10bụ onye sịrị, “Aga m ebipụ mpi ndị ajọ omume niile,
ma a ga-ebuli mpi ndị ezi omume elu.”
75:3 Ya bụ, ntọala
75:4 Mpi na-anọchite anya ike nʼebe a
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.