Abụ Ọma 75:10
Psalms 75:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
bụ onye sịrị, “Aga m ebipụ mpi ndị ajọ omume niile, ma a ga-ebuli mpi ndị ezi omume elu.” 75:3 Ya bụ, ntọala 75:4 Mpi na-anọchite anya ike nʼebe a
Psalms 75:10 in English
Psalms 75:10 · Berean Standard Bible
“All the horns of the wicked I will cut off, but the horns of the righteous will be exalted.”
Context
8Otu iko dị nʼaka Onyenwe anyị
nke jupụtara na mmanya na-agba ụfụfụ nke a gwanyekọtara ụda dị iche iche.
Ọ na-awụpụ ya, ndị ajọ omume niile nke ụwa
na-aṅụ ya ruo mgbe ọ gwụsịrị. 9Ma mụ onwe m, aga m ekwupụta nke a ruo mgbe ebighị ebi.
Aga m abụku Chineke nke Jekọb abụ otuto, 10bụ onye sịrị, “Aga m ebipụ mpi ndị ajọ omume niile,
ma a ga-ebuli mpi ndị ezi omume elu.”
75:3 Ya bụ, ntọala
75:4 Mpi na-anọchite anya ike nʼebe a
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.