Native Bible

Psalms 68:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

elu ụwa mara jijiji, eluigwe wụpụrụ mmiri ozuzo, nʼihu Chineke, Onye Saịnaị, nʼihu Chineke, Chineke nke Izrel.

Psalms 68:8 in English

Psalms 68:8 · Berean Standard Bible

the earth shook and the heavens poured down rain before God, the One on Sinai, before God, the God of Israel.

Context

6Chineke na-eme ka ndị naanị ha nọ nwee ezinaụlọ, ọ na-eji ịbụ abụ dupụta ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma ndị nnupu isi ka ọ na-eme ka ha biri, nʼala kpọrọ nkụ. 7Mgbe i buteere ndị gị ụzọ, O Chineke, mgbe i gabigara nʼala tọgbọrọ nʼefu, Sela 8elu ụwa mara jijiji, eluigwe wụpụrụ mmiri ozuzo, nʼihu Chineke, Onye Saịnaị, nʼihu Chineke, Chineke nke Izrel. 9I nyere mmiri ozuzo nʼebe ọ dị ukwuu, O Chineke, i tutere ihe nketa gị nke ike gwụrụ. 10Ndị gị biri nʼime ya, site nʼoke akụnụba gị, O Chineke, ị rọpụtaara ndị ogbenye mkpa ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.