Abụ Ọma 68:6
Psalms 68:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chineke na-eme ka ndị naanị ha nọ nwee ezinaụlọ, ọ na-eji ịbụ abụ dupụta ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma ndị nnupu isi ka ọ na-eme ka ha biri, nʼala kpọrọ nkụ.
Psalms 68:6 in English
Psalms 68:6 · Berean Standard Bible
God settles the lonely in families; He leads the prisoners out to prosperity, but the rebellious dwell in a sun-scorched land.
Context
4Bụkuo Chineke abụ, bụkuonụ aha ya abụ otuto,
toonu onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya,
Onyenwe anyị bụ aha ya, ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya. 5Ọ bụ nna ndị nke na-enweghị nna, onye na-ekpechitere ndị di ha nwụrụ anwụ ọnụ ha,
onye a bụ Chineke, onye bi nʼebe ya dị nsọ. 6Chineke na-eme ka ndị naanị ha nọ nwee ezinaụlọ,
ọ na-eji ịbụ abụ dupụta ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ,
ma ndị nnupu isi ka ọ na-eme ka ha biri, nʼala kpọrọ nkụ. 7Mgbe i buteere ndị gị ụzọ, O Chineke,
mgbe i gabigara nʼala tọgbọrọ nʼefu, Sela 8elu ụwa mara jijiji, eluigwe wụpụrụ mmiri ozuzo,
nʼihu Chineke, Onye Saịnaị,
nʼihu Chineke, Chineke nke Izrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.