Native Bible

Psalms 68:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị kpọsara okwu ahụ, ọnụọgụgụ ndị inyom kwusara ya bụ igwe dị ọtụtụ;

Psalms 68:11 in English

Psalms 68:11 · Berean Standard Bible

The Lord gives the command; a great company of women proclaim it:

Context

9I nyere mmiri ozuzo nʼebe ọ dị ukwuu, O Chineke, i tutere ihe nketa gị nke ike gwụrụ. 10Ndị gị biri nʼime ya, site nʼoke akụnụba gị, O Chineke, ị rọpụtaara ndị ogbenye mkpa ha. 11Onyenwe anyị kpọsara okwu ahụ, ọnụọgụgụ ndị inyom kwusara ya bụ igwe dị ọtụtụ; 12ndị eze na ndị agha ha ji ọsọ gbalaa; ndị mmadụ kere ihe a dọtara nʼagha, nʼime ọmụma ụlọ ikwu. 13Ọ bụladị mgbe ị na-arahụ ụra nʼetiti ọgba atụrụ, nku abụọ nke nduru m bụ ihe e ji ọlaọcha kpuchie, jirikwa ọlaedo nke na-enwuke kpuchie abụba ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.