Abụ Ọma 65:11
Psalms 65:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị na-eji owuwe ihe ubi bara ụba kpukwasị afọ ọbụla dịka okpueze, ụgbọ na-ebu ihe owuwe ubi na-ejubiga oke.
Psalms 65:11 in English
Psalms 65:11 · Berean Standard Bible
You crown the year with Your bounty, and Your paths overflow with plenty.
Context
9Ị na-elekọta ala na-agba ya mmiri;
ị na-eme ka ọ bụrụ ala dị mma.
Isi iyi Chineke adịghị ata ata,
nʼihi inye ndị mmadụ mkpụrụ ubi,
nʼihi na ọ bụ otu a ka ị chọrọ ka ọ dịrị. 10Ị na-eme ka mmiri jupụta nʼala a kọrọ akọ mee ka elu aja a kọrọ akọ dị larịị;
ị na-eji mmiri ozuzo eme ka ọ dị nro, na-agọzikwa ihe ndị akụnyere na ya. 11Ị na-eji owuwe ihe ubi bara ụba kpukwasị afọ ọbụla dịka okpueze,
ụgbọ na-ebu ihe owuwe ubi na-ejubiga oke. 12Ala ebe ahịhịa na-epu nʼọzara na-ejupụta nʼahịhịa ndụ,
e yikwasịrị ugwu niile obi ụtọ dịka uwe. 13E were igwe anụ ụlọ kpuchie nʼelu ala niile ebe ahịhịa dị ndụ puru,
ọka kpuchikwara ndagwurugwu niile;
ha na-eti mkpu ọṅụ na-abụkwa abụ.
65:2 Aịz 66:23
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.