Native Bible

Psalms 59:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O Chineke, site nʼaka ndị iro m gbapụta m, chebe m site nʼaka ndị na-ebili imegide m.

Psalms 59:1 in English

Psalms 59:1 · Berean Standard Bible

Deliver me from my enemies, O my God; protect me from those who rise against me.

Context

1O Chineke, site nʼaka ndị iro m gbapụta m, chebe m site nʼaka ndị na-ebili imegide m. 2Gbapụta m site nʼaka ndị na-eme ajọ ihe, zọpụtakwa m site nʼaka ndị ogbu mmadụ. 3Lee ka ha siri zoo onwe ha nʼihi ịnapụ m ndụ! Ndị na-eme ihe ike na-agba izu megide m, o Onyenwe anyị, ma ọ bụghị nʼihi ihe m mere maọbụ mmehie m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.