Abụ Ọma 56:9
Psalms 56:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe m ga-akpọku gị maka enyemaka, ndị iro m ga-agbaghachi azụ. Site nʼụzọ dị otu a, aga m amara na Chineke nọnyeere m.
Psalms 56:9 in English
Psalms 56:9 · Berean Standard Bible
Then my enemies will retreat on the day I cry for help. By this I will know that God is on my side.
Context
7Nʼihi ajọ omume ha, ekwekwala ka ha gbapụ;
o Chineke, nʼime iwe gị, wedaa mba ndị a niile dị iche iche nʼala. 8Depụta akwa arịrị m;
chekọtasịa anya mmiri akwa m niile nʼime karama gị.
Ọ bụ na ha adịghị nʼakwụkwọ ndepụta gị? 9Mgbe m ga-akpọku gị maka enyemaka,
ndị iro m ga-agbaghachi azụ.
Site nʼụzọ dị otu a, aga m amara na Chineke nọnyeere m. 10Nʼime Chineke, onye m na-eto okwu ya,
nʼime Onyenwe anyị, onye m na-eto okwu ya, 11nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m.
Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.