Abụ Ọma 52:7
Psalms 52:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ugbu a, lee nwoke ahụ, onye jụrụ ime Chineke ebe mgbaba ya. Ọ tụkwasịrị obi ya na akụnụba ya nke dị ukwuu. O sitekwara na ibibi ndị ọzọ ghọọ onye dị ike!”
Psalms 52:7 in English
Psalms 52:7 · Berean Standard Bible
“Look at the man who did not make God his refuge, but trusted in the abundance of his wealth and strengthened himself by destruction.”
Context
5Nʼezie, Chineke ga-akwatu gị ruo mgbe ebighị ebi.
Ọ ga-ejide gị, dọpụta gị site nʼụlọ ikwu gị,*
ọ ga-ehopukwa gị site nʼala ndị dị ndụ. Sela 6Ndị ezi omume ga-ahụ ya tụkwaa egwu;
ha ga-achị ya ọchị na-asị, 7“Ugbu a, lee nwoke ahụ,
onye jụrụ ime Chineke ebe mgbaba ya.
Ọ tụkwasịrị obi ya na akụnụba ya nke dị ukwuu.
O sitekwara na ibibi ndị ọzọ ghọọ onye dị ike!” 8Ma adị m ka osisi oliv,
nke na-eto na-awasa nʼụlọnsọ ukwu Chineke.
Ana m atụkwasị obi m nʼịhụnanya Chineke,
nke na-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi. 9Aga m eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi nʼihi ihe i mere;
aga m eto gị nʼihu ndị gị dị nsọ.
Olileanya m ga-adị nʼime aha gị,
nʼihi na aha gị dị mma.
52:5 Ya bụ, ebe obibi ya
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.