Abụ Ọma 5:7
Psalms 5:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma mụ onwe m, aga m abata nʼime ụlọ gị, site nʼoke ịhụnanya gị; aga m ejikwa ịtụ egwu kpọọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwuu gị dị.
Psalms 5:7 in English
Psalms 5:7 · Berean Standard Bible
But I will enter Your house by the abundance of Your loving devotion;* in reverence I will bow down toward Your holy temple.
Context
5Ndị mpako agaghị eguzo
nʼihu gị.
Ị kpọrọ ndị niile na-eme ihe ọjọọ asị. 6Ị ga-ala ndị niile na-agha ụgha nʼiyi;
Onyenwe anyị kpọrọ ndị ogbu mmadụ niile
na ndị aghụghọ niile asị. 7Ma mụ onwe m, aga m abata nʼime ụlọ gị,
site nʼoke ịhụnanya gị;
aga m ejikwa ịtụ egwu kpọọ isiala
nʼebe ụlọnsọ ukwuu gị dị. 8Onyenwe anyị, biko, duo m nʼime ezi omume gị
nʼihi ndị iro m;
mee ka ụzọ gị zie ezi nʼihu m. 9Obi ha jupụtara nʼechiche ịla nʼiyi,
a pụghị ịtụkwasị okwu ọbụla si ha nʼọnụ pụta obi.
Akpịrị ha bụ ili ghere oghe;
ha ji ire ha ekwu okwu ụgha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.