Abụ Ọma 5:8
Psalms 5:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị, biko, duo m nʼime ezi omume gị nʼihi ndị iro m; mee ka ụzọ gị zie ezi nʼihu m.
Psalms 5:8 in English
Psalms 5:8 · Berean Standard Bible
Lead me, O LORD, in Your righteousness because of my enemies; make straight Your way before me.
Context
6Ị ga-ala ndị niile na-agha ụgha nʼiyi;
Onyenwe anyị kpọrọ ndị ogbu mmadụ niile
na ndị aghụghọ niile asị. 7Ma mụ onwe m, aga m abata nʼime ụlọ gị,
site nʼoke ịhụnanya gị;
aga m ejikwa ịtụ egwu kpọọ isiala
nʼebe ụlọnsọ ukwuu gị dị. 8Onyenwe anyị, biko, duo m nʼime ezi omume gị
nʼihi ndị iro m;
mee ka ụzọ gị zie ezi nʼihu m. 9Obi ha jupụtara nʼechiche ịla nʼiyi,
a pụghị ịtụkwasị okwu ọbụla si ha nʼọnụ pụta obi.
Akpịrị ha bụ ili ghere oghe;
ha ji ire ha ekwu okwu ụgha. 10Maa ha ikpe, Chineke.
Mee ka nzube ọjọọ ha niile bụrụ ọdịda ha.
Chụpụ ha nʼihi ịba ụba nke ọtụtụ mmehie ha,
nʼihi na ha enupula isi megide gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.