Native Bible

Psalms 5:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụtụtụ ụbọchị niile, O Onyenwe anyị, ị ga-anụ olu m; aga m ekwupụtara gị ihe niile na-akpa m mkpa. Aga m elekwa anya ọsịsa gị.

Psalms 5:3 in English

Psalms 5:3 · Berean Standard Bible

In the morning, O LORD, You hear my voice; at daybreak I lay my plea before You and wait in expectation.

Context

1Onyenwe anyị, biko, nụrụ ekpere m tulee ịsụ ude m. 2Geekwa ntị nʼakwa arịrịọ m, gị Chineke onye bụ eze m. Nʼihi na ọ bụ naanị gị ka m na-akpọku. 3Ụtụtụ ụbọchị niile, O Onyenwe anyị, ị ga-anụ olu m; aga m ekwupụtara gị ihe niile na-akpa m mkpa. Aga m elekwa anya ọsịsa gị. 4Ị bụ Chineke, onye ihe ọjọọ ọbụla anaghị atọ ụtọ; gị na ndị ajọ omume apụghị ibikọta. 5Ndị mpako agaghị eguzo nʼihu gị. Ị kpọrọ ndị niile na-eme ihe ọjọọ asị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.