Native Bible

Psalms 44:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

I meela anyị ka anyị bụrụ ihe ịmaatụ ọchị nʼetiti mba niile, ndị ọbụla hụrụ anyị na-efufe isi na mkparị.

Psalms 44:14 in English

Psalms 44:14 · Berean Standard Bible

You have made us a byword among the nations, a laughingstock * among the peoples.

Context

12I rere ndị gị ọnụ ala, ihe i retara ha abaghị uru nye gị. 13I meela ka anyị bụrụ nkọcha nye ndị agbataobi anyị, anyị bụ ihe ịkwa emo na ihe ọchị nye ndị gbara anyị gburugburu. 14I meela anyị ka anyị bụrụ ihe ịmaatụ ọchị nʼetiti mba niile, ndị ọbụla hụrụ anyị na-efufe isi na mkparị. 15Ogologo ụbọchị niile, ihere m dị m nʼihu, ihere m na-ekpuchikwa m ihu, 16mgbe ndị nkwulu na ndị nkọcha na-eji m eme ihe ọchị, nʼihi onye iro, onye kpebiri ịbọ ọbọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.