Abụ Ọma 43:3
Psalms 43:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Zipụ ìhè gị na eziokwu gị, ka ha duo m; ka ha kpọbata m nʼugwu nsọ gị, bụ ebe i bi.
Psalms 43:3 in English
Psalms 43:3 · Berean Standard Bible
Send out Your light and Your truth; let them lead me. Let them bring me to Your holy mountain, and to the place where You dwell.
Context
1O Chineke, kpepụta m,
kpechitere m ikpe m
nʼebe mba na-amaghị Chineke nọ;
gbapụta m site nʼaka
ndị ajọ omume na ndị aghụghọ. 2Ị bụ Chineke, ebe m e wusiri ike.
Gịnị mere i ji jụ m?
Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ,
nʼihi mmegbu nke onye iro? 3Zipụ ìhè gị na eziokwu gị,
ka ha duo m;
ka ha kpọbata m nʼugwu nsọ gị,
bụ ebe i bi. 4Mgbe ahụ, aga m aga nʼebe ịchụ aja Chineke,
gakwuru Chineke, bụ ọṅụ m na obi ụtọ m.
Aga m eji ụbọ akwara too gị,
O Chineke, bụ Chineke m. 5O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?
Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?
Nwee olileanya na Chineke,
nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ,
onye Nzọpụta m na Chineke m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.