Abụ Ọma 43:5
Psalms 43:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ, onye Nzọpụta m na Chineke m.
Psalms 43:5 in English
Psalms 43:5 · Berean Standard Bible
Why are you downcast, O my soul? Why the unease within me? Put your hope in God, for I will yet praise Him, my Savior and my God.
Context
3Zipụ ìhè gị na eziokwu gị,
ka ha duo m;
ka ha kpọbata m nʼugwu nsọ gị,
bụ ebe i bi. 4Mgbe ahụ, aga m aga nʼebe ịchụ aja Chineke,
gakwuru Chineke, bụ ọṅụ m na obi ụtọ m.
Aga m eji ụbọ akwara too gị,
O Chineke, bụ Chineke m. 5O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?
Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?
Nwee olileanya na Chineke,
nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ,
onye Nzọpụta m na Chineke m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.