Abụ Ọma 43:2
Psalms 43:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị bụ Chineke, ebe m e wusiri ike. Gịnị mere i ji jụ m? Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ, nʼihi mmegbu nke onye iro?
Psalms 43:2 in English
Psalms 43:2 · Berean Standard Bible
For You are the God of my refuge. Why have You rejected me? Why must I walk in sorrow because of the enemy’s oppression?
Context
1O Chineke, kpepụta m,
kpechitere m ikpe m
nʼebe mba na-amaghị Chineke nọ;
gbapụta m site nʼaka
ndị ajọ omume na ndị aghụghọ. 2Ị bụ Chineke, ebe m e wusiri ike.
Gịnị mere i ji jụ m?
Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ,
nʼihi mmegbu nke onye iro? 3Zipụ ìhè gị na eziokwu gị,
ka ha duo m;
ka ha kpọbata m nʼugwu nsọ gị,
bụ ebe i bi. 4Mgbe ahụ, aga m aga nʼebe ịchụ aja Chineke,
gakwuru Chineke, bụ ọṅụ m na obi ụtọ m.
Aga m eji ụbọ akwara too gị,
O Chineke, bụ Chineke m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.