Native Bible

Psalms 34:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha, ma ihe ọbụla bụ ihe ọma agaghị akọ ndị niile na-achọ Onyenwe anyị.

Psalms 34:10 in English

Psalms 34:10 · Berean Standard Bible

Young lions go lacking and hungry, but those who seek the LORD lack no good thing.

Context

8Jiri aka gị tulee ma hụkwa na Onyenwe anyị dị mma; onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya. 9Tụọnụ egwu Onyenwe anyị, unu ndị nsọ ya, nʼihi na ọ dịghị ihe na-akọ ndị niile na-atụ egwu ya. 10Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha, ma ihe ọbụla bụ ihe ọma agaghị akọ ndị niile na-achọ Onyenwe anyị. 11Ụmụ m, bịanụ gee m ntị; aga m ezi unu ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ. 12Onye ọbụla nʼime unu hụrụ ndụ nʼanya, ma nwee ọchịchọ ihu ọtụtụ ụbọchị ndị dị mma,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.