Native Bible

Psalms 18:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị; ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị.

Psalms 18:20 in English

Psalms 18:20 · Berean Standard Bible

The LORD has rewarded me according to my righteousness; He has repaid me according to the cleanness of my hands.

Context

18Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m, ma Onyenwe anyị bụrụ m ihe ndabere. 19Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara, ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ. 20Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị; ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị. 21Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị, ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ. 22Iwu ya niile dị nʼihu m, esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.