Abụ Ọma 147:3
Psalms 147:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ.
Psalms 147:3 in English
Psalms 147:3 · Berean Standard Bible
He heals the brokenhearted and binds up their wounds.
Context
1Toonu Onyenwe anyị!
Ọ bụ ihe dị mma ịbụku Chineke anyị abụ otuto.
Ọ bụ ihe na-eweta mmasị, bụrụkwa ihe ziri ezi ito ya! 2Onyenwe anyị na-ewu Jerusalem:
ọ na-akpọghachita ụmụ Izrel ndị a dọọrọ nʼagha gaa nʼala ọzọ. 3Ọ na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa
na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ. 4Ọ bụ ya na-ekpebi ọnụọgụgụ kpakpando niile
na-akpọkwa ha nʼotu na otu.* 5Onyenwe anyị dị ukwuu, ike ya dịkwa ukwuu;
nghọta ya enweghị nsọtụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.