Abụ Ọma 140:5
Psalms 140:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị mpako esielera m ọnya igbudu; ha agbasaala ụgbụ ha na udo ha, siekwara m ọnya dị iche iche nʼụzọ m na-aga. Sela
Psalms 140:5 in English
Psalms 140:5 · Berean Standard Bible
The proud hide a snare for me; the cords of their net are spread along the path, and lures are set out for me. Selah
Context
3Ha na-eme ire ha ka ha dị nkọ dịka nke agwọ;
elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha.* Sela 4Chebe m Onyenwe anyị, ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-emebi iwu;
chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike,
ndị na-eche echiche ọdịda m. 5Ndị mpako esielera m ọnya igbudu;
ha agbasaala ụgbụ ha na udo ha,
siekwara m ọnya dị iche iche nʼụzọ m na-aga. Sela 6A sịrị m Onyenwe anyị, “Gị onwe gị bụ Chineke m.”
Nụrụ, O Onyenwe anyị, olu arịrịọ m maka amara. 7Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị Onye nzọpụta m dị ike,
ị na-ekpuchi isi m nʼụbọchị agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.