Abụ Ọma 140:3
Psalms 140:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-eme ire ha ka ha dị nkọ dịka nke agwọ; elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha.* Sela
Psalms 140:3 in English
Psalms 140:3 · Berean Standard Bible
They sharpen their tongues like snakes; the venom of vipers is on their lips.* Selah
Context
1O Onyenwe anyị, dọpụta m site nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ.
Chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike dị iche iche. 2Ndị na-atụ atụmatụ ime ihe ọjọọ nʼobi ha
na-akpali agha ụbọchị niile. 3Ha na-eme ire ha ka ha dị nkọ dịka nke agwọ;
elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha.* Sela 4Chebe m Onyenwe anyị, ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-emebi iwu;
chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike,
ndị na-eche echiche ọdịda m. 5Ndị mpako esielera m ọnya igbudu;
ha agbasaala ụgbụ ha na udo ha,
siekwara m ọnya dị iche iche nʼụzọ m na-aga. Sela
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.