Abụ Ọma 137:8
Psalms 137:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gị ada Babilọn, onye a ghaghị ịla nʼiyi, ọṅụ ga-abụ nke onye ahụ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ ruru gị nʼihi ihe i mere anyị,
Psalms 137:8 in English
Psalms 137:8 · Berean Standard Bible
O Daughter of Babylon, doomed to destruction, blessed is he who repays you as you have done to us.
Context
6Ọ bụrụ na m echezọọ gị,
ọ bụrụkwa na m akwụsị iche echiche
banyere Jerusalem, oke ọṅụ m,
ka ire m rapara nʼokpo ọnụ m. 7Cheta, o Onyenwe anyị, ihe ndị Edọm mere
nʼụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha.*
“Tikpọsịa ya,” ka ha tiri,
“Tikpọsịa ya ruo na ntọala ya niile!” 8Gị ada Babilọn, onye a ghaghị ịla nʼiyi,
ọṅụ ga-abụ nke onye ahụ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ ruru gị
nʼihi ihe i mere anyị, 9onye ahụ ga-achịrị ụmụ gị ndị na-aṅụ ara
tụpịa ha nʼelu nkume.*
137:7 Mgbe Nebukadneza meriri Jerusalem, ma bibiekwa ya, ndị Edọm ṅụrịrị oke ọnụ nʼihi na ndị Izrel bụ ndị iro ha. Ma omume a ezighị ezi nʼihi na ndị Edọm na ndị Izrel bụ ụmụnna. Ndị Edọm bụ ụmụ ụmụ Ịsọ, Izk 25:12-14; Ems 1:11; Ọbd 10-14
137:9 Nʼoge agha, ndị meriri nʼagha na-achịkọta ụmụaka niile dị nʼobodo ahụ ha meriri, tụpịasịa ha isi na nkume. Ha na-eme nke a i ji mesie mmeri ha meriri obodo ahụ ike, nakwa i ji mee ka a ghara inwe ọgbọ ọzọ ga-ebili nʼobodo ahụ. 2Ez 8:12; Aịz 13:16; Hos 13:16; Nhu 3:10
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.