Abụ Ọma 137:6
Psalms 137:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na m echezọọ gị, ọ bụrụkwa na m akwụsị iche echiche banyere Jerusalem, oke ọṅụ m, ka ire m rapara nʼokpo ọnụ m.
Psalms 137:6 in English
Psalms 137:6 · Berean Standard Bible
May my tongue cling to the roof of my mouth if I do not remember you, if I do not exalt Jerusalem as my greatest joy!
Context
4Ma, olee otu anyị ga-esi bụọ abụ Onyenwe anyị
ebe anyị nọ nʼala ọzọ? 5Ọ bụrụ na m echezọọ gị, Jerusalem,
ka aka nri m chefuo ǹka ya. 6Ọ bụrụ na m echezọọ gị,
ọ bụrụkwa na m akwụsị iche echiche
banyere Jerusalem, oke ọṅụ m,
ka ire m rapara nʼokpo ọnụ m. 7Cheta, o Onyenwe anyị, ihe ndị Edọm mere
nʼụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha.*
“Tikpọsịa ya,” ka ha tiri,
“Tikpọsịa ya ruo na ntọala ya niile!” 8Gị ada Babilọn, onye a ghaghị ịla nʼiyi,
ọṅụ ga-abụ nke onye ahụ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ ruru gị
nʼihi ihe i mere anyị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.