Native Bible

Psalms 137:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na m echezọọ gị, Jerusalem, ka aka nri m chefuo ǹka ya.

Psalms 137:5 in English

Psalms 137:5 · Berean Standard Bible

If I forget you, O Jerusalem, may my right hand cease to function.

Context

3Nʼebe ahụ ka ndị dọtara anyị nʼagha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ, ndị na-emekpa anyị ahụ rịọrọ anyị ka anyị bụọrọ ha abụ ọṅụ; ha kwuru sị, “Bụọrọnụ anyị otu abụ nʼime abụ Zayọn!” 4Ma, olee otu anyị ga-esi bụọ abụ Onyenwe anyị ebe anyị nọ nʼala ọzọ? 5Ọ bụrụ na m echezọọ gị, Jerusalem, ka aka nri m chefuo ǹka ya. 6Ọ bụrụ na m echezọọ gị, ọ bụrụkwa na m akwụsị iche echiche banyere Jerusalem, oke ọṅụ m, ka ire m rapara nʼokpo ọnụ m. 7Cheta, o Onyenwe anyị, ihe ndị Edọm mere nʼụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha.* “Tikpọsịa ya,” ka ha tiri, “Tikpọsịa ya ruo na ntọala ya niile!”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.