Abụ Ọma 137:5
Psalms 137:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na m echezọọ gị, Jerusalem, ka aka nri m chefuo ǹka ya.
Psalms 137:5 in English
Psalms 137:5 · Berean Standard Bible
If I forget you, O Jerusalem, may my right hand cease to function.
Context
3Nʼebe ahụ ka ndị dọtara anyị nʼagha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ,
ndị na-emekpa anyị ahụ rịọrọ anyị ka anyị bụọrọ ha abụ ọṅụ;
ha kwuru sị, “Bụọrọnụ anyị otu abụ nʼime abụ Zayọn!” 4Ma, olee otu anyị ga-esi bụọ abụ Onyenwe anyị
ebe anyị nọ nʼala ọzọ? 5Ọ bụrụ na m echezọọ gị, Jerusalem,
ka aka nri m chefuo ǹka ya. 6Ọ bụrụ na m echezọọ gị,
ọ bụrụkwa na m akwụsị iche echiche
banyere Jerusalem, oke ọṅụ m,
ka ire m rapara nʼokpo ọnụ m. 7Cheta, o Onyenwe anyị, ihe ndị Edọm mere
nʼụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha.*
“Tikpọsịa ya,” ka ha tiri,
“Tikpọsịa ya ruo na ntọala ya niile!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.