Abụ Ọma 137:3
Psalms 137:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼebe ahụ ka ndị dọtara anyị nʼagha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ, ndị na-emekpa anyị ahụ rịọrọ anyị ka anyị bụọrọ ha abụ ọṅụ; ha kwuru sị, “Bụọrọnụ anyị otu abụ nʼime abụ Zayọn!”
Psalms 137:3 in English
Psalms 137:3 · Berean Standard Bible
for there our captors requested a song; our tormentors demanded songs of joy: “Sing us a song of Zion.”
Context
1Nʼakụkụ iyi niile Babilọn ka anyị nọdụrụ ala kwaa akwa
mgbe anyị chetara Zayọn. 2Ọ bụ nʼosisi pọpla
ka anyị kokwasịrị ụbọ akwara anyị niile. 3Nʼebe ahụ ka ndị dọtara anyị nʼagha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ,
ndị na-emekpa anyị ahụ rịọrọ anyị ka anyị bụọrọ ha abụ ọṅụ;
ha kwuru sị, “Bụọrọnụ anyị otu abụ nʼime abụ Zayọn!” 4Ma, olee otu anyị ga-esi bụọ abụ Onyenwe anyị
ebe anyị nọ nʼala ọzọ? 5Ọ bụrụ na m echezọọ gị, Jerusalem,
ka aka nri m chefuo ǹka ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.