Native Bible

Psalms 110:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị nọ nʼaka nri gị. Ọ ga-egwepịa ndị eze nʼụbọchị oke iwe ya.

Psalms 110:5 in English

Psalms 110:5 · Berean Standard Bible

The Lord is at Your right hand; He will crush kings in the day of His wrath.

Context

3Nʼụbọchị ị ga-ebu agha, ndị agha gị niile ga-ahọrọ nʼonwe ha i soro gị. Ndị yikwasịrị ịma mma nke ịdị nsọ ka uwe, bụ ụmụ okorobịa gị ga-abịakwute gị dịka igirigi site nʼafọ ụtụtụ. 4Onyenwe anyị aṅụọla iyi, ọ gaghị agbanwe uche ya: “Gị onwe gị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, nʼusoro Melkizedek.” 5Onyenwe anyị nọ nʼaka nri gị. Ọ ga-egwepịa ndị eze nʼụbọchị oke iwe ya. 6Ọ ga-ekpe mba niile ikpe, na-atụkọta ndị nwụrụ anwụ, ma gwepịa ndị na-achị achị nʼelu ụwa niile. 7Ọ ga-aṅụ mmiri site nʼiyi nta nke dị nʼakụkụ ụzọ; nʼihi nke a, ọ ga-eweli isi ya elu. 110:1 Nʼoge ochie, a na-arụ ocheeze nʼebe dị elu, ma nwee ihe nrigo e ji arịgoru ya. Mgbe ahụ, ndị eze na-achịkwasa ụkwụ ha nʼolu ndị ha meriri nʼagha, Mat 22:44; Mak 12:36; Luk 20:42-43; Hib 1:13; 1Kọ 15:25.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.