Abụ Ọma 110:5
Psalms 110:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị nọ nʼaka nri gị. Ọ ga-egwepịa ndị eze nʼụbọchị oke iwe ya.
Psalms 110:5 in English
Psalms 110:5 · Berean Standard Bible
The Lord is at Your right hand; He will crush kings in the day of His wrath.
Context
3Nʼụbọchị ị ga-ebu agha,
ndị agha gị niile ga-ahọrọ nʼonwe ha i soro gị.
Ndị yikwasịrị ịma mma nke ịdị nsọ ka uwe,
bụ ụmụ okorobịa gị ga-abịakwute gị
dịka igirigi site nʼafọ ụtụtụ. 4Onyenwe anyị aṅụọla iyi,
ọ gaghị agbanwe uche ya:
“Gị onwe gị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi,
nʼusoro Melkizedek.” 5Onyenwe anyị nọ nʼaka nri gị.
Ọ ga-egwepịa ndị eze nʼụbọchị oke iwe ya. 6Ọ ga-ekpe mba niile ikpe, na-atụkọta ndị nwụrụ anwụ,
ma gwepịa ndị na-achị achị nʼelu ụwa niile. 7Ọ ga-aṅụ mmiri site nʼiyi nta nke dị nʼakụkụ ụzọ;
nʼihi nke a, ọ ga-eweli isi ya elu.
110:1 Nʼoge ochie, a na-arụ ocheeze nʼebe dị elu, ma nwee ihe nrigo e ji arịgoru ya. Mgbe ahụ, ndị eze na-achịkwasa ụkwụ ha nʼolu ndị ha meriri nʼagha, Mat 22:44; Mak 12:36; Luk 20:42-43; Hib 1:13; 1Kọ 15:25.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.